ABÙ ỌMA 47 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma umu Kora.

1Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka;

Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke.

2N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu;

Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile.

3Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi,

Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi.

4Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi,

Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya. Selah

5Chineke ewerewo iti-nkpu rigo,

Jehova ewerewo olu opì-ike rigo.

6Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma:

Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma.

7N'ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu:

Bùkuenu Ya abù ọma, maschil.

8Chineke aghọwo eze mba nile:

Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya.

9Ndi amara aha-ha nke ndi nile di iche iche achikọtawo onwe-ha

Ibu ndi Chineke nke Abraham:

N'ihi na Chineke nwe ọta nile nke uwa;

Emewo ka Ọ di elu nke-uku.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help