EZIKIEL 42 - Bible Lgbo

1O we me ka m'puta ba n'ogige ahu di n'èzí, n'uzọ ahu nke di n'uzọ Ugwu: o we me ha m'ba n'ime-ulo ahu nke di na ncherita-iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, nke di kwa na ncherita-iru ulo ahu anēwu ewu n'akuku Ugwu.

2N'iru ogologo nke ọgu cubit ise ka ọnu-uzọ nke Ugwu di, obosara-ya di kwa ọgu cubit abua na iri.

3Na ncherita-iru orú cubit ahu nke diri ogige di nime, na na ncherita-iru pavement nke diri ogige di n'èzí, ka ulo-njeghari nke nēche iru n'ulo-njeghari ọzọ di n'okpukpu atọ.

4N'iru ime-ulo nile ka otù uzọ-njeghari di, nke di cubit iri n'obosara n'ime, ọ bu uzọ nke di otù cubit: ọnu-uzọ nile ha chere iru n'Ugwu.

5Ma ime-ulo nke kachasi elu di nkpunkpu kari: n'ihi na ulo-njeghari nēbipu ihe na ndia, kari nke ha nēbipu n'ime-ulo di ala ma-ọbu n'ime-ulo etiti, n'ulo ahu anēwu ewu.

6N'ihi na okpukpu atọ ka ha di, ha enweghi kwa ogidi dika ogidi nke ogige abua ahu: n'ihi nka emere ka ime-ulo nke kachasi elu di nkpa kari nke di ala na nke etiti site n'ala.

7Ma mb͕idi nke di n'èzí n'akuku ime-ulo nile, n'uzọ ogige di n'èzí n'iru ime-ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri.

8N'ihi na ogologo nke ime-ulo nke diri ogige di n'èzí di ọgu cubit abua na iri: ma, le, n'iru ulo uku Chineke ọ di ọgu cubit ise.

9Site kwa n'okpuru ime-ulo ndia ka nbata di n'akuku Iru-anyanwu, ebe anēsi n'ogige di n'èzí abata nime ha.

10N'ib͕idi nke mb͕idi ogige n'uzọ Iru-anyanwu, n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, na n'iru ulo ahu anēwu ewu, ka ime-ulo di iche iche di.

11Uzọ nke di n'iru ha di kwa ka uzọ nke ime-ulo nke di n'uzọ Ugwu si di n'ile ha anya; dika ogologo-ha si di, otú a ka obosara-ha di: ọpùpù nile ha di ka ikpé nile ha si di, na dika ọnu-uzọ nile ha si di.

12Ma dika ọnu-uzọ nile nke ime-ulo nile si di nke di n'uzọ Ndida, otú a ka otù ọnu-uzọ si di nke di n'isi uzọ, bú uzọ nke di n'iru mb͕idi n'uzọ Iru-anyanwu, ebe anābà nime ha.

13O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n'ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n'ihi na ebe ahu di nsọ.

14Mb͕e ndi-nchu-àjà nābà nime, ha agaghi-esi kwa n'ebe nsọ ahu puta n'ogige di n'èzí, kama n'ebe ahu ka ha gāwusa uwe-ha nke ha ji eje ozi; n'ihi na ihe nsọ ka ha bu: ha ewe yiri uwe ọzọ we biarue ihe diri ndi-ha.

15Ma mb͕e ọ tùzusiri ulo ime-ime, o we me ka m'puta n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu, o we tùa ya buruburu n'akuku nile.

16O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Iru-anyanwu nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya buruburu.

17O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Ugwu buruburu, nnù ami na ọgu ise.

18Akuku Ndida ka ọ tùru, nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya.

19O chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu, were ami o ji atù ihe tùa ya, nnù ami na ọgu ise.

20N'akuku anọ ka ọ tùru ya: o nwere mb͕idi buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di nnù na ọgu ise, obosara-ya di kwa nnù na ọgu ise, ikpa ókè n'etiti ihe di nsọ na ihe emere ka ọ ghara idi nsọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help