I. SAMUEL 29 - Bible Lgbo

1Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha nile rue Efek: Israel nāma kwa ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi nke di na Jezreel.

2Ndi-isi ndi Filistia we nāgabiga ọgu ise, ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: Devid na ndikom-ya nāgabiga kwa n'azu, ha na Ekish.

3Ndi-isi Filistia we si, Ndi-Hibru ndia, hà bu gini? Ekish we si ndi-isi ndi Filistia, Nkà abughi Devid, bú orù Sọl eze Israel, onye mu na ya nọworo ubọchi ndia ma-ọbu arọ ndia, ma ahutaghm n'aru ya ihe ọ bula di njọ site n'ubọchi ọ dapuru n'aka Sọl rue ta?

4Ma ndi-isi ndi Filistia were iwe megide ya; ndi-isi ndi Filistia we si ya, Me ka nwoke a laghachi, ka o we laghachi n'ọnọdu-ya ebe i mere ka ọ buru onye-nlekọta-ya, ma ka ọ ghara iso ayi rida n'agha, ka o we ghara ighọrọ ayi onye-nmegide n'agha ahu: n'ihi na onye a gēji gini me ka ihe-ya tọ onye-nwe-ya utọ? ọ̀ gaghi-eji isi ndikom ndia?

5Nkà abughi Devid, onye ha zaritara onwe-ha ihe bayere ya n'ite-egwú si,

Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,

Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?

6Ekish we kpọ Devid, si ya, Jehova nādi ndu, n'ezie onye ziri ezi ka i bu: ọpupu-gi na nbata-gi n'ọmuma-ulo-ikwū n'akam di kwa nma n'anyam: n'ihi na ahutaghm ihe ọjọ n'aru gi site n'ubọchi i biakuterem rue ta: ma n'anya ndi-isi onye nādighi nma ka i bu.

7Ma ub͕u a, laghachi, je kwa n'udo, ka i we ghara ime ihe ọjọ n'anya ndi-isi ndi Filistia.

8Devid we si Ekish, Ma gini ka m'meworo? gini kwa ka i hutaworo n'aru orù-gi site n'ubọchi m'nọworo n'iru gi rue ta, na m'gaghi-abà buso ndi-iro onye-nwem, bú eze, agha?

9Ekish we za, si Devid, Amawom na onye di nma n'anyam ka i bu, dika mọ-ozi Chineke: ọ bu nání na ndi-isi Filistia asiwo, Ọ gaghi-eso ayi rigo n'agha.

10Ma ub͕u a bilie n'isi-ututu, gi na ndi-orù onye-nwe-gi ndi soro gi bia: mb͕e unu biliri n'isi-ututu, mb͕e ìhè diri unu, laghachi-kwa-nu.

11Devid we bilie n'isi-ututu, ya onwe-ya na ndikom-ya, ila n'ututu, ilaghachi n'ala ndi Filistia. Ndi Filistia we rigo rue Jezreel.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help