NDI EFESỌS 4 - Bible Lgbo

1Ya mere mu onwem, bú onye-nkpọrọ nime Onye-nwe-ayi, nāriọ unu ka unu jegharia dika o kwesiri ọkpukpọ nke akpọrọ unu,

2n'obi di ume-ala na idi-nwayọ nile, n'ogologo ntachi-obi, nānagiderita ibe-unu nime ihu-n'anya;

3nānu ọku n'obi idebe idi-n'otù nke Mọ Nsọ nime ihe-ọkiké nke bu udo.

4Otù aru di, otù Mọ di kwa, dika akpọ-kwa-ra unu nime otù olile-anya nke ọkpukpọ-unu;

5otù Onye-nwe-ayi di, otù okwukwe di, otù baptism di,

6otù Chineke na Nna nke ayi nile di, Onye bu isi ayi nile, Onye site-kwa-ra n'aka ayi nile nālu ọlu, Onye nānọ kwa nime ayi nile.

7Ma ọ bu ayi nile n'otù n'otù ka enyere amara ahu dika ọtùtù nke onyinye Kraist si di.

8N'ihi nka Ọ si,

Mb͕e Ọ rigoro n'elu, Ọ dọtara usu ndi adọtara n'agha n'agha,

Nye kwa madu onyinye di iche iche.

9(Ma okwu nka, Ọ rigoro, gini ka ọ bu ma-ọbughi na Ọ rida-kwa-ra nime akuku uwa dikariri ala?

10Onye ridara bu kwa Onye ahu Nke rigoro n'ebe kachasi elu-igwe nile elu nke-uku, ka O we mezu ihe nile.)

11Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí;

12ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo:

13rue mb͕e ayi nile gēru idi-n'otù nke okwukwe na nke nmazu nke Ọkpara Chineke, ru ibu nwoke tozuru okè, ru ọtùtù nke ogologo nke ozuzù nke Kraist:

14ka ayi we ghara ibu umu ọhu ọzọ, ndi ifufe nile ọ bula nke ozizí nēfeghari nēbughari kwa, nime itu-ntu nke madu, nime aghughọ, nke ha ji ezuputa nduhie;

15kama ka ayi we nēso ezi-okwu nime ihu-n'anya, we tó etó rue nime Ya n'ihe nile, Onye bu isi-ayi, bú Kraist;

16Onye aru nile, ebe anēwere nkwonkwo nile ọ bula nke nnyezu kwukọ ya nke-ọma jikọ kwa ya, dika ilusi-ọ1u-ike nke akuku nile ọ bula n'otù n'otù n'ọtùtù-ha si di, aru nile ahu nēsite na Ya nēme ka aru ba uba iwuli onwe-ya elu dika ulo nime ihu-n'anya.

17Ya mere nka ka m'nēkwu, kwusi kwa ike nime Onye-nwe-ayi, ka unu ghara ijeghari ọzọ dika ndi mba ọzọ nējeghari kwa, n'ihe-efu nke uche-ha,

18n'ihi na emewo ka ha b͕a ọchichiri n'èchìchè-uche-ha, eme kwa ka ha buru ndi ala ọzọ n'ebe ndu nke Chineke di n'ihi amaghi-ihe di nime ha, n'ihi na anēme ka obi-ha me etili;

19madu ndi, ebe nmehie-ha nādighi-ewuta ha ọzọ, ha rara onwe-ha nye n'aka agu ikwa-iko, iluputa adighi-ọcha nile nime anya-uku.

20Ma unu onwe-unu amutaghi Kraist-ayi otú a;

21asi na ọ bu ezie na ọ bu Ya onwe-ya ka unu nuru, asi kwa na ọ bu nime Ya ka ezíri unu ihe, dika ezi-okwu di nime Jisus:

22ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n'uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di;

23ka eme kwa ka unu di ọhu na mọ nke uche-unu,

24ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.

25N'ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n'ihi na ayi nāburita ihe di n'aru ibe-ayi.

26Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu:

27enye-kwa-la ekwensu uzọ.

28Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.

29Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara.

30Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa.

31Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu:

32nweritanu obiọma n'aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help