ZEKARAIA 9 - Bible Lgbo

1Ibu okwu Jehova nke eboro ala Hadrak, Damaskọs gābu kwa ebe-izu-ike-ya: n'ihi na n'ebe Jehova nọ ka anya madu na nke mba nile nke Israel di:

2na Hemat nke nwe-kwa-ra ókè-ala-ya: Taia na Zaidon, n'ihi na ọ mara ihe nke-uku.

3Taia we wuere onwe-ya ebe ewusiri ike, tukọba ọla-ọcha dika ájá, na ọla-edo ọma dika apiti nke amá.

4Le, Onye-nwe-ayi gānapu ya ala-ya, tikue ike-ya n'oké osimiri, ọ bu kwa ya onwe-ya ka ọku gēripia.

5Ashkelon gāhu ya, tua egwu; Geza kwa, ọ gāb͕ali kwa nke-uku; Ekron kwa, n'ihi na ihere gēme ntukwasi-obi-ya: eze gālanari kwa Geza n'iyi, madu agaghi-ebi kwa n'Ashkelon.

6Nwa iko gēbi kwa n'Ashdod, M'gēbipu kwa npako ndi Filistia.

7M'gēwezuga kwa ọbara nile ya n'ọnu-ya, wezuga kwa ihe-árú-ya nile n'etiti ezé-ya; ọ gāfọdu-kwa-ra Chineke-ayi, ọbuná ya onwe-ya: ọ gādi kwa ka otù onye-isi nke nnù madu abua na ọgu iri nime Juda, Ekron gādi kwa ka onye Jebus.

8M'gāma-kwa-ra ulom ulo-ikwū, dika ebe-nguzo-ndi-agha, n'ihi onye-ngabiga na n'ihi onye nālata: ka onye nāchi n'ihe-ike we ghara igabiga kwa n'akuku ha ọzọ: n'ihi na ub͕u a ka M'jiworo anyam abua hu.

9Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.

10M'gēbipu kwa ub͕ọ-ala n'Efraim, bipu kwa inyinya na Jerusalem, agēbipu kwa uta agha; Ọ gāgwa kwa mba nile okwu udo:Ọ gāchi kwa achi site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.

11Gi onwe-gi kwa, n'ihi ọbara ọb͕ub͕a-ndu-gi ka M'zipuworo ndi-nkpọrọ-gi n'olùlù nke miri nādighi nime ya.

12Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi.

13N'ihi na azọworom Onwem Juda ukwu ikwe ya dika uta, uta ahu ka M'mejuworo n'Efraim dika àkú; M'gākpọte kwa umu-gi, Zaion, imegide umu-gi, Jevan, M'gēme kwa gi ka i di ka mma-agha dike.

14Ọ bu kwa Jehova ka agāhu n'elu ha, àkú-Ya gāpu kwa dika àmùmà: Onye-nwe-ayi Jehova gāfù kwa opì-ike, je ije n'oké ifufe di iche iche nke Ndida.

15Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi ha; ha gēripia kwa, zọda nkume èbè nile; ha gāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me nkpọtu dika site na manya-vine: ha gējuputa kwa dika ọkwa-nwusa, dika nkuku nile nke ebe-ichu-àjà.

16Jehova, bú Chineke-ha, gāzọputa kwa ha n'ubọchi ahu dika ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi-Ya: N'ihi na nkume di oké ọnu-ahia nke okpu-eze ka ha gābu, ndi eweliworo elu dika ọkọlọtọ n'elu ala-Ya.

17N'ihi na le ka idi-nma-Ya si di uku! le kwa ka ima-nma-Ya si di uku! ọka gemeka umu-okorọbia tozue okè nke-ọma, manya-vine ọhu kwa umu-ab͕ọghọ nke nāmaghi nwoke.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help