EKLISIASTIS 10 - Bible Lgbo

1Ijiji nwuru anwu nēme ka manu onye nāsugwa manu-otite nke nēsì ísì utọ sìe ísì ọjọ, re kwa ure: otú a ka nzuzu ntà di arọ́ kari amam-ihe, kari kwa nsọpuru.

2Obi onye mara ihe di n'aka-nri-ya; ma obi onye-nzuzu di n'aka-ekpe-ya.

3Ọzọ kwa, mb͕e onye-nzuzu nēje ije n'uzọ, obi-amam-ihe-ya nākọnari ya, ọ we si madu nile na onye-nzuzu ka ọ bu.

4Ọ buru na mọ nke onye nāchi achi ebilie imegide gi, arapula ọnọdu-gi; n'ihi na ime-nwayọ nēme ka nmehie uku di iche iche kwusi.

5Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ọ di ka ihe emere n'amaghi-ama nke nēsi n'aka onye nāchi achi aputa:

6etiyere nzuzu n'ebe di iche iche di elu ri nne, ma ndi-ọgaranya nānọdu n'ebe di ala.

7Ahuwom ndi-orù ka ha nānọkwasi n'inyinya, ahuwokwam ndi-isi ka ha nējeghari dika ndi-orù n'elu uwa.

8Onye nēgwu olulu, nime ya ka ọ gādabà; ọzọ, onye nētipú mb͕idi, agwọ gāta ya aru.

9Onye nēbupu nkume, o gēb͕u ya nb͕u site na ha; onye nāwa osisi nọ n'ize-ndu site na ya.

10Ọ buru na ígwè anyua nkọ, ma onye ahu amughi iru-ya amu, ọ gētiye kwa ike kari: ma amam-ihe nāba urù ime ka ihe nāgazi agazi.

11Ọ buru na agwọ ata aru tutu arà ya urà, ọ dighi kwa urù ọ gābara onye-nwe ire-utọ.

12Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.

13Nmalite okwu nile nke ọnu-ya bu nzuzu: nkwubì okwu-ọnu-ya bu kwa iwi-ara ọjọ.

14Onye-nzuzu nēme kwa ka okwu ba uba: madu adighi-ama ihe ọ bula nke gādi adi; ọzọ, ihe gādi mb͕e ọ gasiri, ònye gēgosi ya?

15Ndọb͕u nke ndi-nzuzu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nāgwu onye ọ bula nime ha ike, n'ihi na ọ maghi ijeru obodo.

16Ahuhu gādiri gi, ala, mb͕e eze-gi bu nwata, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe n'ututu!

17Ihe nāgara gi nke-ọma, ala, mb͕e eze-gi bu nwa ndi amara aha-ha, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe na mb͕e oriri, n'ihi idi-ike, ọ bughi kwa n'ihi iṅubiga-manya-ókè!

18Site n'okè ume-ngwu ka elu ulo nēze eze; site kwa n'ifanye aka n'ukwu ka ulo nēhi mmiri.

19N'ihi ichì-ọchì ka anēsi nri, manya-vine nēme ka ndu ṅuria: ego nāza kwa ihe nile.

20Ọbuná n'uche-gi akọchala eze; akọcha-kwa-la ọgaranya n'ime-ulo-ndina-gi: n'ihi na anu-ufe nke elu-igwe gēme ka olu-gi rue ya nti, ihe nwere nkù gēgosi kwa okwu ahu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help