EZIKIEL 35 - Bible Lgbo

1Okwu Jehova we ruem nti, si,

2Nwa nke madu, che iru-gi imegide ugwu Sia, bue amuma megide ya,

3si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, ugwu Sia, M'gēseti kwa akam imegide gi, M'gēme kwa ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya.

4Obodo-gi nile ka M'gēme ka ha ghọ nkpọnkpọ ebe, gi onwe-gi gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu; i we mara na Mu onwem bu Jehova.

5N'ihi na i nwere iro ebighi-ebi, we rara umu Israel nye n'aka mma-agha na mb͕e nhuju-anya-ha, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu:

6n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie nání ọbara ka M'gēme gi ka i ghọ, ọbara ganāchu kwa gi: ọ bu ezie na i kpọghi ọbara asì, ma ọbara gāchu gi.

7M'gēme kwa ugwu Sia ka ọ ghọ ihe-iju-anya na ebe tọb͕ọrọ n'efu; M'gēbipu kwa nime ya onye nāgabiga na onye nālaghachi.

8M'gēmeju kwa ugwu-ya nile na ndi-ya eb͕uru eb͕u: ugwu ntà gi nile na ndagwurugwu-gi nile na ebe-gi nile miri si erù, ndi ejiri mma-agha b͕u gāda nime ha.

9Ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme gi ka i ghọ, madu agaghi-ebi kwa n'obodo-gi nile: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

10N'ihi na i siwo, Mba abua ndia na ala abua ndia gābu nkem, ayi gēnweta kwa ya; ma Jehova nọrọ n'ebe ahu:

11n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gēme kwa dika iwe-gi si di, na dika ekworo-gi si di nke i kwoworo site n'asì i kpọrọ ha; Mgēme kwa ka amara Mu onwem n'etiti ha, mb͕e M'gēkpe gi ikpe.

12I gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, anuwo okwu-nlelì-gi nile nke i kwuworo megide ugwu nile nke Israel, si, Ha bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ayi ka ewereworo ha nye ka ayi we ripia ha.

13Unu we were ọnu-unu me onwe-unu ka unu di uku imegidem, me ka okwu-unu ba uba imegidem: Mu onwem anuwo.

14Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: ka ọṅù nke uwa nka nile ra, otú a ka M'gēme gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.

15Dika i ṅuriri ọṅu n'isi ihe-nketa nke ulo Israel, n'ihi na ọ tọb͕ọrọ n'efu, otú a ka M'gēme gi: ebe tọb͕ọrọ n'efu ka i gābu, gi ugwu Sia, na Edom nile, ọbuná Edom nile: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help