ABÙ ỌMA 82 - Bible Lgbo

Abù Ọma Esaf.

1Chineke nēguzo Onwe-ya nime nzukọ Chineke;

N'etiti chi nile ka Ọ nēkpe ikpe.

2Rùe ole mb͕e ka unu gēkpe ikpe ajọ omume?

Rù kwa ole mb͕e ka unu gāhu ndi nēmebi iwu iru-ọma?

3Kpenu onye nēnweghi ike na nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi:

Guanu onye ewedara n'ala na onye nọ na nkpà n'onye ezi omume.

4Menu ka onye nēnweghi ike na ob͕eye b͕apu:

Naputanu ha n'aka ndi nēmebi iwu.

5Ha amaghi, ha aghọtaghi kwa;

N'ọchichiri ka ha nējeghari:

Ewezugawo ntọ-ala nile nke uwa n'ọnọdu-ha.

6Mu onwem siri, Chi ka unu bu,

Ọ bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu ka unu bu.

7Otú ọ di, dika madu ka unu gānwu,

Ọ bu kwa dika otù nime ndi-isi ka unu gādà.

8Bilie, Chineke, kpe uwa ikpe:

N'ihi na Gi onwe-gi gēketa ihe, bú mba nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help