1Jehova we gwa Moses okwu, si,
2Nye umu Israel iwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganābata n'ala Kenean, (nka bu ala nke gēru unu aka n'ihe-nketa, bú ala Kenean dika ókè-ala-ya-nile si di,)
3akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n'ọzara Zin n'akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n'Iru-anyanwu:
4ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon:
5ókè-ala ahu gēsi kwa n'Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri.
6Ókè-ala ọdida-anyanwu kwa, unu gēnwe ọbuná oké osimiri uku ahu na ókè-ya: nka gāburu unu ókè-ala Ọdida-anyanwu
7Nka gābu-kwa-ra unu ókè-ala Ugwu: unu gēsi n'oké osimiri uku ahu kpaputara onwe-unu ugwu Hoa:
8unu gēsi n'ugwu Hoa kpaputarue nbata Hemat; ọpupu nile nke ókè-ala ahu gādiru kwa Zedad:
9ókè-ala ahu gāputaru Zifron, ọpupu-ya nile gādiru kwa Heza-inan: nka gāburu unu ókè-ala Ugwu.
10Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam:
11ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n'akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n'Iru-anyanwu:
12ókè-ala ahu gāridaru kwa Jọdan, ọpupu-ya nile gādiru kwa Oké Osimiri Nnu: nka gāburu unu ala, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu.
13Moses we nye umu Israel iwu, si, Nka bu ala ahu nke unu gēketa n'ife-nzà, nke Jehova nyere iwu bayere ya inye ebo iteghete ahu na nkera ebo ahu:
14n'ihi na ebo umu ndi Reuben dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ebo umu ndi Gad dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, anarawo, nkera ebo Manase anarawo kwa, ihe-nketa-ha;
15ebo abua ahu na nkera ebo ahu anarawo ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan nka na nso Jeriko n'akuku Iru-anyanwu, n'uzọ ọwuwa-anyanwu.
16Jehova we gwa Moses okwu, si,
17Ndia bu aha ndikom ahu ndi gēme ka unu keta ala ahu: Eleeza, bú onye nchu-àjà, na Joshua nwa Nun.
18Ọ bu kwa otù onye-isi otù onye-isi site n'ebo ọ bula ka unu gēkuru, ime ka eketa ala ahu.
19Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune.
20Nke ebo umu Simeon, Shemuel nwa Amihud.
21Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon.
22Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli.
23Nke umu Josef: nke ebo umu Manase otù onye-isi, bú Haniel nwa Ifod:
24nke ebo umu Efraim otù onye-isi kwa, bú Kemuel nwa Shiftan.
25Nke ebo umu Zebulun otù onye-isi kwa, bú Elizafan nwa Panak.
26Nke ebo umu Isaka otù onye-isi kwa, bú Paltiel nwa Azan.
27Nke ebo umu Asha otù onye-isi kwa, bú Ahihud nwa Shelomi.
28Nke ebo umu Naftali otù onye-isi kwa, bú Padahel nwa Amihud.
29Ndia bu ndi Jehova nyere iwu ime ka umu Israel Keta ala n'ala Kenean.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.