ABÙ ỌMA 83 - Bible Lgbo

Abù, bú Abù Ọma Esaf.

1Chineke, edebela ọnu-Gi du:

Ab͕ala nkiti, anọ-kwa-la jū, Chineke.

2N'ihi na, le, ndi-iro-Gi nāb͕a aghara:

Ọzọ, ndi nākpọ Gi asì ebuliwo isi-ha.

3Ọ bu imegide ndi-Gi ka ha nāb͕a ìzù aghughọ,

Ha nāb͕a ìzù imegide ndi-Gi edebeworo na nzuzo.

4Ha asiwo, Jenu, ka ayi zopu ha n'ibu mbe;

Agaghi-echeta kwa aha Israel ọzọ.

5N'ihi na ha ewerewo otù obi b͕arita ìzù;

Ọ bu imegide Gi ka ha nāb͕a ndu:

6Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael;

Moab na ndi Haga;

7Gebal, na Amon, na Amalek;

Filistia, ya na ndi bi na Taia:

8Asiria araparawo kwa n'aru ha;

Ha aghọworo umu Lot ogwe aka. Selah

9Me ha otú I mere Midian;

Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon:

10Ekpochapuru ha n'En-doa;

Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.

11Me ndi-ha amara aha-ha ka ha di ka Oreb, na dika Zeeb;

Me kwa ka ndi-isi-ha nile di ka Zeba na dika Zalmuna:

12Ndi siri, Ka ayi nwetara onwe-ayi

Ebe-obibi nile nke Chineke.

13Chinekem, me ka ha di ka ihe nke ifufe nēfeghari buruburu,

Dika ahihia n'iru ifufe.

14Dika ọku nke nēré oke ọhia,

Na dika ire-ọku nke nēme ka ugwu nile nwuru ọku;

15Otú a were oké ifufe-Gi chua ha,

Were kwa oké ikuku-Gi me ka ha ma jijiji.

16Me ka nlelì che ha iru;

Ka ha we chọ aha-Gi, Jehova.

17Ka ihere me ha, ka ha ma kwa jijiji rue mb͕e ebighi-ebi;

E, ka ha nwe iru-ihere, la n'iyì:

18Ka ha we mara na Gi onwe-gi, Onye aha-Gi bu Jehova, nání Gi,

Bu Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help