JOB 27 - Bible Lgbo

1Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,

2Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém;

Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;

3(N'ihi na ogologo mb͕e nile umem di nimem,

Mọ nke Chineke di kwa n'imem;)

4N'ezie eb͕ub͕ere-ọnum adighi-ekwu okwu ajọ omume,

Irem adighi-atamu kwa ntamu aghughọ.

5Ya burum ihe-árú ọ buru na aguam unu na ndi ezi omume:

Rue mb͕e m'kubìri ume m'gaghi-esi n'ebe m'nọ wezuga izu-okèm.

6Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka:

Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile.

7Ka onye-irom di ka onye nēmebi iwu,

Ka onye nēbili imegidem di kwa ka onye ajọ omume.

8N'ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya,

Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya?

9Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya,

Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?

10Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ?

Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?

11M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke;

M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.

12Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;

N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?

13Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ,

Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.

14Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;

Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.

15Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu,

Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.

16Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá,

Dozie uwe dika urọ;

17O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya,

Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha.

18O wuwo ulo-ya dika nla,

Na dika ulo-ntu nke onye-nche meworo.

19O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya;

Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.

20Ihe-egwu nēru ya aru dika miri;

Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.

21Ifufe Iru-anyanwu nēburu ya, o we la;

O we fechapu ya n'ọnọdu-ya.

22Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya:

N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.

23Madu gākuru ya aka,

Ma ya ọsọ chupu ya n'ọnọdu-ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help