ABÙ ỌMA 144 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke Devid.

1Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu,

Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù:

Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha:

2Eberem, na ebem ewusiri ike,

Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu;

Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya;

Onye nāzọda ndim n'okpurum.

3Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya?

Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?

4Madu yiri otù nku-ume

Ubọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.

5Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida:

Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku.

6Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa;

B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha.

7Si n'elu setipu aka-Gi;

Dọputam, naputakwam n'ọtutu miri,

N'aka ndi ala ọzọ;

8Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,

Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

9Chineke, abù ọhu ka m'gābùku Gi:

Une nke akwara iri ka m'gēji bùkue Gi abù ọma.

10Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa:

Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n'ọnu mma-agha jọrọ njọ.

11Dọputam, nāputakwam n'aka ndi ala ọzọ,

Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu,

Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha.

12Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n'ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata;

Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku;

13Ọba-ayi ejuwo, nēweputa ihe nile di iche iche;

Igwè ewu na aturu nile ayi nāmuputa nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, orú nnù na nnù ise orú nnù na nnù ise, n'èzí nile ayi;

14Anēboju ehi nile ayi ibu nke-ọma;

Ọ dighi nitpú di na mb͕idi-ayi, ọ dighi kwa ọpupu di,

Ọ dighi kwa iti-nkpu di n'amá nile ayi;

15Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke di otú a:

Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke Jehova bu Chineke-ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help