ABÙ ỌMA 24 - Bible Lgbo

Abù Ọma Devid.

1Jehova nwe uwa na ùjú-ya;

Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.

2N'ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n'elu oké osimiri nile,

Me kwa ka o guzosie ike n'elu osimiri nile.

3Ònye gārigo n'ugwu Jehova?

Ònye gēguzosi kwa ike n'ebe nsọ Ya?

4Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha;

Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu,

Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ.

5Ọ gānata ngọzi n'aka Jehova,

Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya.

6Nka bu ọb͕ọ nke ndi nācho Ya,

Bú ndi nāchọsi iru-Gi ike, Chineke nke Jekob. Selah

7Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu;

Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi:

Eze ebube gābata kwa.

8Ònye kwa bu Eze ebube a?

Ọ bu Jehova, Nke bu dìnkpà na dike,

Ọ bu Jehova, Nke bu dike n'agha.

9Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu;

Buli-kwa-nu ha elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi:

Eze ebube gābata kwa.

10Ònye ka Ọ bu, bú Eze ebube a?

Ọ bu Jehova nke usu nile nke ndi-agha,

Ya onwe-ya bu Eze ebube a. Selah

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help