JOB 35 - Bible Lgbo

1Elaihu we nāza, si,

2Ọ̀ bu nka ka i nēchè na ọ bu ikpé-gi?

Ma-ọbu Ì siwo, Ezi omumem kariri nke Chineke?

3Na i nāsi, Gini ka ọ bara Gi?

Ùrù gini ka ọ baram kari nmehiem?

4Mu onwem gāzaghachi gi,

Gi na ndi-eyì-gi.

5Legide elu-igwe anya, hu;

Kiri kwa mbara-ígwé nile nke di elu kari gi.

6Ọ buru na i mehiewo, gini ka i nēmegide Ya?

Ọ buru kwa na njehie-gi abawo uba, gini ka i neme Ya?

7Ọ buru na i bu onye ezi omume, gini ka i nēnye Ya?

Ma-ọbu gini ka Ọ nānara n'aka-gi?

8Nmebi-iwu-gi gēmetu nwoke dika gi;

Ezi omume-gi gēmetu kwa nwa nke madu.

9N'ihi iba-uba nke nmeb͕u ka ha nēti nkpu;

Ha nētiku onye gēyere ha aka n'ihi ogwe-aka ndi di ike.

10Ma ọ dighi onye siri, Òle ebe Chineke nọ, bú Onye merem,

Onye nēnye abù ọma n'abali;

11Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa,

Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?

12N'ebe ahu ka ha nēti nkpu, ma Ọ dighi-aza,

N'ihi npako di ọjọ.

13N'ezie Chineke agaghi-anu ihe-efu,

Onye puru ime ihe nile agaghi-ekiri kwa ya.

14Otú ọ di, mb͕e i nāsi na i dighi-ekiri Ya,

Okwu-ikpe-gi di n'iru Ya, i gēchere kwa Ya.

15Ma ub͕u a, n'ihi na iwe-Ya eletaghi,

Na n'ihi na Ọ ribaghi njehie ama nke-uku;

16N'ihi ya ka Job nāsaghepu ọnu-ya n'efu;

Ọ bughi n'ọmuma-ihe ka O nēme ka okwu-ya nile ba uba.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help