ABÙ ỌMA 4 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'ubọ-akwara. Abù Ọma Devid.

1Mb͕e m'kpọrọ, Gi zam, Chineke nke ezi omumem;

I nyewom ebe sara mbara mb͕e m'nọ na nkpà:

Merem amara, nuru ekperem.

2Umu madu, rùe ole mb͕e ka nsọpurum gāghọ itiye n'ọnọdu-ihere?

Unu nāhu ihe-efu n'anya, nāchọ okwu-ugha.

3Ma maranu na Jehova ekewaputaworo Onwe-ya onye-ebere:

Jehova nānu mb͕e m'kpọkuru Ya.

4Manu jijiji, emehie-kwa-la:

Sinu otú a n'obi-unu n'elu ihe-ndina-unu, we dere du. Selah

5Chuanu àjà ezi omume,

Tukwasi-kwa-nu obi na Jehova.

6Ọtutu madu nāsi, Ònye gēme ka ayi hu ọdi-nma?

Jehova, bulie ìhè iru-Gi ka ọ mukwasi ayi.

7I tiyewo ọṅù n'obim,

Kari nke ha nwere na mb͕e ọka-ha na manya-vine ọhu ha ji aba uba.

8N'udo ka m'gēji otù mb͕e ahu dina ala, raru ura:

N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, nání Gi, nēme ka m'biri na ntukwasi-obi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help