1Nyenu Jehova, unu umu Chineke,
Nyenu Jehova nsọpuru na ike.
2Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya;
Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.
3Olu Jehova di n'elu miri:
Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe,
Jehova nọ n'elu ọtutu miri.
4Olu Jehova nāda n'ike;
Olu Jehova nāda n'ima-nma.
5Olu Jehova nētiwa osisi cedar;
Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon.
6Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi;
Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.
7Olu Jehova nāwaputa ire ọku.
8Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu;
Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu.
9Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele,
Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia:
Ọzọ n'ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube.
10Jehova nọduru n'oche-eze n'Iju-miri ahu;
Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi.
11Jehova gēnye ndi-Ya ike;
Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.