ABÙ ỌMA 30 - Bible Lgbo

Abù Ọma; Abù nke ira Ulo ahu nye Chineke; Abù Ọma nke Devid.

1M'gēbuli Gi elu, Jehova; n'ihi na I dọgowom n'elu,

I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam.

2Jehova, bú Chinekem,

Etikurum, I, I we me ka m'diri ndu.

3Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n'ala-mọ rigoputa:

I mewo ka m'si n'etiti ndi nārida n'olùlù di ndu.

4Bùkuenu Jehova abù ọma, unu ndi-ebere-Ya,

Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.

5N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya;

Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ:

N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali,

Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.

6Ma mu onwem, asirim n'udom,

Agaghi-ewezugam n'ọnọdum rue mb͕e egighi-ebi.

7Jehova, I ji ka ihem si atọ Gi utọ me ka ike guzoro ukwu m:

I zobere iru-Gi; aghọrọm onye nāma jijiji.

8Gi, Jehova, ka m'nākpọku;

Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m'nāriọ aririọ-amara:

9Ùrù gini di n'ọbaram, mb͕e m'na-arida n'olùlù?

Ájá, ọ̀ gēkele Gi? ò gēgosi ezi-okwu-Gi?

10Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara:

Jehova, buru onye nēyerem aka.

11I b͕anweworom iti-aka-n'obim ka ọ ghọ ite-egwú;

I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké:

12Ka nsọpurum we bùkue Gi abù ọma, ghara idere du.

Jehova, bú Chinekem rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gēkele Gi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help