JEREMAIA 12 - Bible Lgbo

1Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m'gēkwu n'ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n'udo?

2I kuwo ha dika osisi, e, ha ab͕awo nkpọrọgwu; ha nētó, e, ha amiwo nkpuru: nso ka I nọ n'ọnu-ha, ma I nọ akuru-ha n'ebe di anya.

3Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n'ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.

4Rùe ole mb͕e ka ala gēru újú? rùe ole mb͕e ka ihe-ọkukú nke ubi nile gākpọnwu? site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya ekpochapuwo anu-ulo nile na anu-ufe; n'ihi na ha siri, Ọ gaghi-ahu ikpe-azu-ayi.

5Asi na i so ndi ji ukwu eje b͕a ọsọ, ha we me ka ike gwu gi, ì gēsi kwa aṅa nu ọku n'obi ib͕akari inyinya? ọ bu kwa n'ala udo ka i nọ na ntukwasi-obi, ma ì gēsi aṅa me na nbili-elu nke Jọdan?

6N'ihi na ọbuná umu-nne-gi, na ulo nna-gi, ọbuná ha onwe-ha aghọb͕uwo gi; ọbuná ha onwe-ha akpọzuwo nkpu n'azu gi: ekwela ha, mb͕e ha gāgwa gi ezi ihe.

7Arapuwom ulom, ajuwom ihe-nketam; ewerewom nwayi nke ihe-ya nātọ nkpuru-obim utọ nke-uku nye n'ọbu-aka ndi-iro-ya.

8Ihe-nketam aghọworom ihe dika ọdum n'oké ọhia: o mewo ka olu-ya da megidem; n'ihi nka ka M'kpọworo ya asì.

9Ọ̀ bu udele turu agwa ka ihe-nketam dirim? udele, hà nọ ya buruburu nēmegide ya? jenu, chikọta anu ọhia nile, me ka ha bia iri ihe.

10Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n'efu.

11O mewo ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; o nēru újú n'ebe m'nọ, ebe ọ tọb͕ọrọ n'efu; ebe tọb͕ọrọ n'efu ka ala nka nile bu, n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n'obi.

12N'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi nke di n'ọzara ka ndi nāpunara madu ihe biaworo: n'ihi na mma-agha Jehova nwere nēripia site n'otù nsọtu nke ala we rue nsọtu ọzọ nke ala: ọ dighi udo anu-aru ọ bula, bú madu, nwere.

13Ha aghawo ọka wheat, ma ogwu bu ihe-ubi ha wereworo; ha aghọwo ndi-ọria, ma ọ dighi-abara ha urù: ka ihere ihe-omume nile unu me kwa unu, sita n'iwe di ọku nke Jehova.

14Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M'meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M'gaje iropu ha n'elu ala-ha, ulo Juda ka M'gēropu kwa n'etiti ha.

15O gēru kwa, mb͕e M'ropusiri ha, na M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha ọzọ; M'gēme kwa ka ha lata, onye ọ bula n'ihe-nketa-ya, na onye ọ bula n'ala-ya.

16Ọ gēru kwa, ọ buru na ha amuta uzọ nile nke ndim nke-ọma, iji aham ṅu iyi, si, Jehova nādi ndu; dika ha zíri ndim iji Beal ṅu iyi; agēwuli kwa ha dika ulo n'etiti ndim.

17Ma ọ buru na ha anughi, M'gēropu kwa mba ahu, nēropu ya nēme kwa ka ọ la n'iyì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help