Mkpughe Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ a na-akọwa ihe ndị ahụ niile ga-emezu nʼoge dị nʼihu. O kpughere nye anyị ihe banyere nlọghachi Jisọs Kraịst na ihe ndị ọzọ ga-eme mgbe ọ ga-alọghachi. Akwụkwọ a kpughekwara gosi anyị na tupu Kraịst alọghachi ntaramahụhụ na oke ihe egwu na mbibi na ịla nʼiyi dị iche iche ga-adị. Kraịst ga-alọghachi mgbe ihe ndị a niile mezuru. Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-edozi ihe niile, kpee ndị ajọ omume ikpe, hichapụ anya mmiri, ma wezuga ọnwụ na ihe mgbu niile ruo mgbe ebighị ebi.Usoro e si dee ya:Ọhụ mmalite 1Akwụkwọ ozi asaa 2–3Chineke na Nwa atụrụ 4–5Nnyakapụ akara asaa 6:1–8:5Opi ike asaa 8:6–11:19Agha a lụrụ nʼụwa na nʼeluigwe 12–14Iko ọnụma asaa 15–16Ikpe ọmụma dịrị Babilọn 17–19Ọgwụgwụ ụwa na ụwa nke na-abịa 20–22