1Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị,
ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela
2Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa,
marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.
3Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;
ka mmadụ niile too gị.
4Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ,
nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ,
na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela
5Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;
ka mmadụ niile too gị.
6Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya,
Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.
7Chineke ga-agọzi anyị,
nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.