Abụ Ọma 119 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 119א Alef

1Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla,

ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị.

2Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya

ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.

3Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla;

ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile.

4I doola ụkpụrụ

ndị a ga-erubekwara isi.

5Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike

na-erube isi nye iwu gị niile!

6Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m

mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.

7Aga m eji obi ziri ezi too gị

dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.

8Aga m erubere iwu gị niile isi;

biko ahapụkwala m.

ב Bet

9Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ?

Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.

10Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.

Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.

11Ezoola m okwu gị niile nʼobi m,

igbochi m imehie imegide gị.

12Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị;

kuziere m iwu gị niile.

13Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa

iwu niile nke si nʼọnụ gị.

14Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile

dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.

15Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị

na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.

16Iwu gị na-amasị m;

agaghị m elefu okwu gị anya.

ג Gimel

17Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ;

aga m erubere okwu gị isi.

18Kpughee anya m abụọ

ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.

19Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa;

ezonarịla m iwu gị niile.

20Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile

na-agụ mkpụrụobi m agụụ.

21Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ

na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.

22Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị,

nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.

23Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m,

ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị.

24Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m;

ha bụ ndị ndụmọdụ m.

ד Dalet

25Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu;

kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.

26Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m;

ugbu a, kuziere m iwu gị.

27Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị;

ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile.

28Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba;

gbaa m ume dịka okwu gị si dị.

29Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile;

site nʼiwu gị meere m amara.

30Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi;

e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.

31O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike;

ekwela ka ihere mee m.

32Aga m agbaso iwu gị niile

nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.

ה He

33O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile;

mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.

34Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị

ma jiri obi m niile rubere ya isi.

35Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile,

nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.

36Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile

ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.

37Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru;

chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.

38Mezuo nkwa i kwere ohu gị,

ka a tụọ egwu gị.

39Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya,

nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.

40Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike!

Chebe ndụ m site nʼezi omume gị.

ו Waw

41O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m,

nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị;

42mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị,

nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.

43Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu,

nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.

44Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi

ruo mgbe ebighị ebi.

45Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe

nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.

46Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze

ma ihere agaghị eme m,

47nʼihi na iwu gị na-amasị m

nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya.

48Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya,

ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.

ז Zayin

49Cheta okwu i nyere ohu gị,

nʼihi na i nyela m olileanya.

50Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a:

nkwa gị na-echebe ndụ m.

51Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka,

ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m.

52O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie,

ha na-ewetara m nkasiobi.

53Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume,

ndị gbakụtara iwu gị azụ.

54Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m

ebe ọbụla m na-anọ.

55Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị,

aga m edebekwa iwu gị.

56Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile:

ana m erubere ụkpụrụ gị isi.

ח Het

57O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m;

ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.

58Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị;

meere m ebere dịka nkwa gị si dị.

59Echeela m echiche banyere ụzọ m niile,

chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile.

60Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge

irubere iwu gị niile isi.

61A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ,

agaghị m echefu iwu gị.

62Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele

nʼihi iwu gị niile ziri ezi.

63Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị,

ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.

64O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị;

kuziere m iwu gị niile.

ט Tet

65Meere ohu gị ihe ọma

dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị.

66Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi

nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile.

67Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m,

ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi.

68I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi;

kuziere m iwu gị niile.

69Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m,

ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị.

70Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha,

ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị.

71Ọ dị mma na m tara ahụhụ

ka m nwee ike mụta iwu gị niile.

72Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m

karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo.

י Yod

73Aka gị kere m, kpụọkwa m;

nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.

74Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m,

nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.

75O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi,

ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ.

76Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi,

dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.

77Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ,

nʼihi na iwu gị na-amasị m.

78Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere;

ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.

79Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m,

ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile.

80Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile,

ka ihere ghara ime m.

כ Kap

81Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị,

ma olileanya m dị nʼokwu gị.

82Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị;

ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”

83Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ,

anaghị m echefu iwu gị niile.

84Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche?

Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?

85Ndị mpako na-egwuru m olulu,

bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.

86Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi;

nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha.

87Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi,

ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ.

88Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m,

ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị.

ל Lamed

89O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe.

90Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;

ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike.

91Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike,

nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.

92A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m,

agaara m anwụ nʼime nsogbu m.

93Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile,

nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.

94Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị;

achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.

95Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi,

ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.

96Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke,

ma iwu gị niile enweghị nsọtụ.

מ Mem

97O, otu m si hụ iwu gị nʼanya!

Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.

98Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m,

ha na-anọnyere m oge niile.

99Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe,

nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.

100Enwere m nghọta karịa ndị okenye

nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.

101Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla

ka m nwee ike rubere okwu gị isi

102Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile,

nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.

103Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ,

ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!

104A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile;

ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.

נ Nun

105Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m

bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.

106Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike,

na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.

107Ataala m ahụhụ nke ukwuu;

chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị.

108O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m,

kuziekwara m iwu gị niile.

109Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile,

ma echezọghị m iwu gị.

110Ndị ajọ omume esielera m ọnya,

ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.

111Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi;

ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.

112Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị

ruo na ngwụcha.

ס Samek

113Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị,

ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.

114Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m;

olileanya m dị nʼokwu gị.

115Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ,

ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m!

116Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ;

ekwekwala ka olileanya m daa.

117Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara;

aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile.

118Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị,

nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi.

119Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu;

nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya.

120Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị;

ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.

ע Ayin

121Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi;

ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.

122Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya;

ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.

123Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị

ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.

124Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị

ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.

125Abụ m ohu gị, nye m nghọta,

ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.

126O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ,

nʼihi na a na-emebi iwu gị.

127Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya

karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha,

128nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi,

akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị.

פ Pe

129Iwu gị niile dị ịtụnanya;

ya mere, ana m erubere ha isi.

130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè;

ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.

131Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike,

na-achọsi iwu gị niile ike.

132Chee m ihu, meere m ebere,

dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.

133Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị;

ekwela ka mmehie chịa m.

134Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m,

ka m nwee ike debe iwu gị.

135Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị.

Kuziere m ụkpụrụ gị niile.

136Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu

nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị.

צ Tsade

137O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume,

iwu gị niile zikwara ezi.

138Ụkpụrụ gị niile ziri ezi;

ha kwesiri ntụkwasị obi.

139Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya,

ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.

140Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma,

ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.

141Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya,

ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.

142Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Iwu gị niile bụkwa eziokwu.

143Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m,

ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.

144Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi;

nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.

ק Kwof

145Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị,

aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.

146Ana m akpọku gị; zọpụta m

aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.

147Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka;

olileanya m dị nʼokwu gị.

148Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m,

nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.

149Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị;

chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị.

150Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso

ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.

151Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị;

ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.

152Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị,

na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

ר Resh

153Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m,

nʼihi na echefughị m iwu gị.

154Kpepụta m, gbapụta m,

chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.

155Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ,

nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.

156O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu;

chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.

157Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ,

ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.

158Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi,

nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.

159Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya;

chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.

160Okwu gị niile bụ eziokwu;

iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

ש Sin na Shin

161Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere,

ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị.

162Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị

dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.

163Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ,

ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.

164Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị,

nʼihi iwu gị ziri ezi.

165Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu,

ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.

166Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị,

na-agbasokwa iwu gị niile.

167Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi

nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.

168Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi,

nʼihi na ị maara ụzọ m niile.

ת Taw

169Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị;

nye m nghọta dịka okwu gị si dị.

170Ka arịrịọ m ruo gị ntị;

gbapụta m dịka nkwa gị si dị.

171Ka ọnụ m jupụta nʼotuto,

nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.

172Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị,

nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.

173Nọọ na njikere oge niile inyere m aka,

nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile.

174Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị,

iwu gị bụ ihe na-amasị m.

175Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị,

ka iwu gị niile gbaa m ume.

176Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu,

chọọ ohu gị,

nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help