Abụ Ọma 11 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 11Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.Onyenwe anyị ebe mgbaba

1Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m.

Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,

“Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”

2Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;

ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,

zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,

ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.

3Mgbe a na-ebibi ntọala niile,

gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?

4 Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya;

Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.

Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;

anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.

5 Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule,

ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,

ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.

6Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume

dịka mmiri ozuzo;

oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.

7Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume,

ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya;

ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help