Diuteronomi Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ihe dị nʼakwụkwọ a bụ okwu niile Mosis gwara ụmụ Izrel nʼobosara ala Moab tupu ha amalite ịbanye nʼala Kenan. Nʼokwu ya, Mosis kpọtụrụ uche ha nʼihe gbasara ihe niile dakwasịrị ha nʼoge gara aga, rịọsie ha arịrịọ ike sị ha rubere Chineke isi, ma tụkwasịkwa obi ha na nchebe ya. Ọ kpọkuru ndị Izrel niile sị ha werekwa onwe ha nyefee ọzọ nʼọrụ ahụ Chineke tinyere ha nʼaka ịrụ. Emesịa, o duru ha ịbụ abụ na ofufe nke ha fere Chineke. Mgbe a họpụtasịrị Joshua dị ka onyendu ọhụrụ ha nwere, Mosis hapụrụ ndị Izrel, pụọ gaa ebe ọ nọ nwụọ.Usoro e si dee ya:Okwu mbụ Mosis gwara ụmụ Izrel 1–4

Okwu nke abụọ Mosis gwara ụmụ Izrel 5–26

Okwu gbasara iwu dị iche iche 27–28

Okwu Mosis na nhọpụta Joshua 29:1–32:43

Okwu ikpeazụ Mosis kwuru na ọnwụ ya 32:44–34:12

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help