Jeremaya Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ihe e dere nʼakwụkwọ a bụ ihe gbasara ọrụ ibu amụma nke Jeremaya rụrụ na Juda. Jeremaya dọrọ ndị bi nʼoge ya aka na ntị sị ha nabatara onwe ha ikpe ọmụma nke Chineke na-aga inye ha nʼihi mmehie ha. O mere ka o doo ndị Juda anya na Chineke enyefeela ha nʼaka ndị agha Babilọn ndị ga-emeri ha nʼagha, gbuchapụ ndị niile bi na Jerusalem, ma mebikwaa ụlọnsọ ukwu Chineke. Ọ rịọsiri ha arịrịọ ike sị ha chegharịa, ma site na mmehie ha tụgharịa, ma ha aṅaghị ya ntị. Kama ịṅa ya ntị, ha kparịrị ya, taa ya ahụhụ nʼụzọ dị iche iche. Jeremaya bukwara amụma kwuo ihe Chineke na-ezube imere ndị ya nʼoge dị nʼihu.Usoro e si dee ya:Amụma banyere Juda 1–25

Amụma ndị ọzọ 26–42

Amụma Jeremaya buru nʼIjipt 43–45

Amụma banyere mba dị iche iche 46–51

Akụkọ dị iche iche 52

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help