Abụ nke Abụ 2 - Igbo Contemporary Bible 2020

Onye a hụrụ nʼanya

1Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn,

na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

2E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu,

otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.

Onye a hụrụ nʼanya

3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa,

mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ.

Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya,

mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.

4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri,

ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.

5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume;

werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike,

nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.

6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,

aka nri ya na-ejikụ m.

7Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,

eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị:

Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta,

ruo mgbe ọ masịrị ya.

8Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya!

Lee ya ka ọ na-abịa,

na-amali elu nʼelu ugwu niile,

na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.

9Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele.

Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị,

ọ na-esikwa na oghereikuku

na nʼoghere dị ya na-elebata anya.

10Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m,

“Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ,

onye m mara mma, soro m.

11Lee, oge oyi agafeela,

udu mmiri agabigakwala.

12Okoko osisi epupụtala nʼala;

oge eji agụ egwu eruokwala,

a na-anụ abụ nduru

nʼala anyị niile.

13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,

isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.

Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.

Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

14Nduru m nọ nʼọgba nkume,

nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu,

gosi m ihu gị,

mee ka m nụ olu gị,

nʼihi na olu gị dị ụtọ,

ihu gị makwara mma.

15Jidenụ nkịta ọhịa,

ụmụ nkịta ọhịa niile

na-emebiri anyị ubi,

ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.

Onye a hụrụ nʼanya

16Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya.

Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,

17tutu chi ụtụtụ abọọ

mgbe onyinyo niile na-agabigakwa.

Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya,

dị ka mgbada

maọbụ nwa ele

nke nọ nʼelu ugwu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help