1 Ihe E Mere Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ Ihe E Mere nke mbụ na nke abụọ bụ otu akwụkwọ. Ọ bụ akwụkwọ akụkọ, dị ka akwụkwọ Ndị Eze. Kama ihe dị iche bụ na ndị dere akwụkwọ Ihe E Mere bụ ndị nchụaja, ma ndị dere akwụkwọ Ndị Eze bụ ndị amụma. Ihe e ji bido akwụkwọ Ihe E Mere nke mbụ bụ usoro ọmụmụ dị iche iche, nke na-egosi usoro ọmụmụ ezinaụlọ Devid, na usoro ọmụmụ ezinaụlọ Livayị nna nna ndị nchụaja. Emesịa, a kọrọ akụkọ ọnwụ Sọl, kọọkwa akụkọ ọchịchị Devid. Ma nʼakụkọ ndị a, ihe e bu nʼuche kọọ ha bụ igosi ihe bụ ọnọdụ ife Chineke nʼoge ndị a. Ọ bụ akụkọ gbasara echichi eze e chiri Solomọn ka e ji mechie akwụkwọ a.Usoro e si dee ya:Usoro ọmụmụ 1–9

Ọnwụ Sọl 10

Ọchịchị Devid 11:1–23:23

Ụlọnsọ ukwu na ndị Livayị 23:24–27:34

Ọnọdụ Devid nʼoge ịbụ agadi ya 28–29

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help