Aịzaya 21 - Igbo Contemporary Bible 2020

Amụma e buru banyere Babilọn

1Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri:

Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga,

ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa,

site nʼala nke oke egwu.

2Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi,

na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo.

Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu!

Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị.

3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu,

oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme.

Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ,

ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.

4Obi m anọkwaghị jụụ,

oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu;

chi ojiji nke m na-ele anya ya

aghọọlara m ihe ịma jijiji.

5Ha na-akwado tebul.

Ha na-edozi ute ịnọdụ ala,

ha na-eri, ha na-aṅụ.

Bilienụ ndịisi agha,

teekwanụ ọta niile mmanụ!

6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m,

“Gaa, guzobe onye nche,

ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.

7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha,

na usuu ịnyịnya,

na ndị na-agba ịnyịnya ibu,

maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ,

gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma,

nọọkwa na njikere.”

8Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị,

“Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche,

nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile.

9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa,

ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ.

O nyeghachiri ọsịsa ahụ,

‘Babilọn adaala, e ọ daala,

arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile

a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ”

10O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka,

agwala m unu ihe

Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile

bụ Chineke Izrel kwuru.

Amụma banyere Edọm

11Nke a bụ amụma megide Duma:

Otu onye si na Sia na-akpọ m oku,

“Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?

Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?”

12Onye nche zara sị,

“Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ,

ma laghachikwa ọzọ.”

Amụma e buru banyere Arebịa

13Amụma megide Arebịa:

Unu ndị ije niile nke Dedan,

ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke Arebịa,

14kuterenụ ndị ahụ bịakwutere unu akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ọṅụṅụ;

unu ndị bi nʼala Tema,

buterenụ ndị gbakwutere unu ọsọ ndụ nri.

15Nʼihi na ọ bụ site nʼagha

nke e ji mma agha egbu ndị mmadụ,

na agha e ji akụ agbatu mmadụ

ka ha si na-agbapụ ọsọ.

16Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị m, “Tupu otu afọ agwụ, dị ka esi agụ afọ onye ohu e goro ọrụ, ịma mma Keda ga-agwụsị.

17Ndị fọdụrụ ndụ nʼime ndị na-agba ụta, ndị bụ dike nʼagha na Keda, ga-adị mmadụ ole na ole.” Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel ekwuola ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help