Ndị Hibru Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:E nweghị nkwekọrịta nʼetiti ndị ọkachamara akwụkwọ nsọ banyere onye dere akwụkwọ a. Ma ọtụtụ kwenyere na ọ bụ Pọl dere ya. Ihe e bu nʼuche dee akwụkwọ a bụ Jisọs Kraịst. E gosiri ndị Juu nʼakwụkwọ a na ọbịbịa Kraịst bịara emeela ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti Chineke na mmadụ. E gosikwara na ọgbụgba ndụ ọhụrụ a dị mma karịa ọgbụgba ndụ ochie. Site nʼọgbụgba ndụ ọhụrụ a mmadụ nwere ike ugbu a ịbịaru Chineke nso, nʼihi na ọbịbịa Kraịst emeela ka usoro ọchụchụ aja nke ọgbụgba ndụ ochie ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga. Ịdọ aka na ntị dị iche iche dịkwa nʼakwụkwọ a banyere nnupu isi na ekweghị ekwe.Usoro e si dee ya:Ịdị ukwuu Kraịst 1–3Ndụ ọhụrụ onye Kraịst nwere 4:1-13Onyeisi nchụaja ọhụrụ 4:14–8:13Ọgbụgba ndụ ọhụrụ 9–10Ndị mgbe ochie na okwukwe ha 11Ndụmọdụ banyere obibi ndụ onye Kraịst 12:1–13:19Okwu mmechi 13:20-25