Aịzaya 25 - Igbo Contemporary Bible 2020

Toonu Onyenwe anyị

1O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m;

aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto,

nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke,

ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama,

nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga.

2Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe;

mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ;

meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi,

agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi.

3Nʼihi nke a, ndị niile dị ike ga-asọpụrụ gị.

Obodo ndị ahụ na-emenye ndị mba ọzọ egwu ga-atụ gị egwu.

4Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba;

ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha,

ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo,

na ndo nʼoge okpomọkụ.

Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere

dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi,

5dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara.

Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị,

dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ,

otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị.

6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile

ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri.

Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile.

Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị.

7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ,

nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile,

nke kpuchikwara ihu ndị mba niile.

8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile

site nʼihu mmadụ niile,

ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile

dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile.

Onyenwe anyị ekwuola ya.

9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị,

“Nke a bụ Chineke anyị nʼezie,

anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị.

Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi,

ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.”

10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a,

ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha,

dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.

11Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya,

dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya,

ma Chineke ga-eweda mpako ha niile,

nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha.

12Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike,

mee ka ha daruo ala,

ọ ga-eme ka ha daruo ala,

ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help