Abụ Ọma 76 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 76Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.Ike mmeri nke Chineke

1A maara Chineke nʼobodo Juda;

aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.

2Ụlọ ikwu ya dị na Salem,

ebe obibi ya dị na Zayọn

3Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma,

na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela

4Ị jupụtara nʼìhè,

ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.

5A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha,

ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha;

o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a

pụrụ iweli aka ya abụọ elu.

6Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb,

ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.

7Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu.

Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?

8I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị.

Ụwa tụkwara egwu, dere duu,

9mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe,

ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela

10Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,

ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.

11Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha;

ka ndị ala niile bụ agbataobi unu

wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.

12Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala;

ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help