Zekaraya 9 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ikpe ọmụma megide ndị iro Izrel

1Okwu Amụma.

Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak,

na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike,

nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile

na ebo niile nke Izrel dị.

2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;

tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.

3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,

tụkọba ọlaọcha dịka aja,

na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.

4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere

ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri,

ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.

5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.

Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu.

Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla.

A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya.

Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.

6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,

aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.

7Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha,

wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya.

Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị,

ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda.

Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.

8Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche,

ka ndị iro ghara ịbata na ya.

Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha,

nʼihi na anọ m na nche ugbu a.

Ọbịbịa nke eze Zayọn

9Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn!

Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem!

Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị,

onye ezi omume na onye nwere mmeri,

onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu,

ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.

10Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem,

na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem;

a ga-agbajikwa ụta agha.

Ọ ga-ewetara mba niile udo,

ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ,

sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa.

11Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha,

nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.

12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya.

Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.

13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m,

tinye Ifrem dịka àkụ.

Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn,

ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis.

Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.

Onyenwe anyị

ga-egosi onwe ya

14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha,

àkụ ya ga-efekwa dịka amụma.

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike,

ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.

15 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha.

Ha ga-ebibi,

zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile.

Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya;

ha ga-ejupụta dịka efere,

dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.

16Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya,

dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya.

Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa

e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.

17Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu!

Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma,

mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help