1Abụ nke abụ nke Solomọn.
Onye a hụrụ nʼanya2Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ,
nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.
3Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma,
aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta,
ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.
4Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa.
Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya.
Ndị EnyiAnyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị.
Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya.
Onye a hụrụ nʼanyaLee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
5Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya,
unu ụmụ agbọghọ Jerusalem.
Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda
dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
6Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji.
Ọ bụ anwụ gbajiri m.
Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m,
zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị,
ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.
7Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya,
ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri?
Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie?
Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu
nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.
Ndị Enyi8Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma,
soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ
meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa
dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya9Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya
e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.
10Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma,
olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.
11Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo,
nke e ji ọlaọcha chọọ mma.
Onye a hụrụ nʼanya12Mgbe eze nọ na tebul ya,
mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.
13Onye m hụrụ dị m ka ụda máá e kechiri nʼakpa
nke dị nʼetiti ara m abụọ.
14Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna
nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.Onye hụrụ ibe ya nʼanya
15Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya.
Leenụ ka ị si maa mma!
Anya gị dịka nduru.
Onye a hụrụ nʼanya16Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke.
E, ị mara mma.
Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya17Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida,
ntuhie ya bụkwa osisi fịa.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.