Luk Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Luk bụ dibịa bekee onye soro Pọl jegharịa mgbe Pọl na-ekwusa oziọma. Ọ ghọtaziri ihe banyere ndụ na ọrụ Jisọs Kraịst nke ọma, nʼihi ya ọ sara anya mmiri nyochapụta ihe niile gbasara ya detuo ha nʼakwụkwọ iji gosi onye Griik aha ya bụ Tiofilọs, onye Jisọs bụ, na ọrụ ọ rụrụ. Luk na-egosi nʼakwụkwọ oziọma a na Kraịst bụ Chineke, bụrụkwa mmadụ nʼezie.Usoro e si dee ya:Ọmụmụ Jisọs na ntolite ya 1–2Baptizim na ọnwụnwa 3:1–4:13Ọrụ dị iche iche na Galili 4:14–9:50Jisọs agaa Jerusalem 9:51–19:27Ọrụ Jisọs rụrụ na Jerusalem 19:28–20:47Amụma banyere oge dị nʼihu 21Ọnwụ na mbilite nʼọnwụ 22–24