Abụ Ọma 52 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 52Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil Devid. Nke o bụrụ mgbe Doeg onye Edọm gara gwa Sọl sị, “Devid gara hụ Ahimelek nʼụlọ ya.”Ihe na-eche ndị ajọ omume

1Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike?

Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi,

gị onye Chineke na-eleda anya?

2Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi;

ọ dị ka agụba dị nkọ,

gị onye na-ebi ndụ aghụghọ.

3Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma,

ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. Sela

4O onye ire aghụghọ!

Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.

5Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị,

ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela

6Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu;

ha ga-achị ya ọchị na-asị,

7“Ugbu a, lee nwoke ahụ,

onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya.

Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu.

O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”

8Ma adị m ka osisi oliv,

nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke.

Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke,

nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.

9Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere;

aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ.

Olileanya m ga-adị nʼime aha gị,

nʼihi na aha gị dị mma.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help