Jemis Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Jemis bụ nwanne Jisọs (Lee anya nʼakwụkwọ Mak 6:3). Ọ bụkwa onyendu nzukọ Kraịst dị na Jerusalem. Ọ bụ ndị Juu kweere na Kraịst ka o degaara akwụkwọ a. Ọ kọwara nʼakwụkwọ a na ndị kweere na Kraịst bụ ndị nwere amamihe na mmụọ ntachiobi. Ndị dị otu a kwesiri isite nʼọrụ ọma ha na-arụ na ndụ zuruoke ha na-ebi gosi na ha bụ ndị kweere na Kraịst nʼezie.Usoro e si dee ya:Ezi ndụ onye nwere okwukwe 1Ngosi kwesiri ịpụta ihe 2:1-13Okwukwe na ọrụ ọma 2:14-26Okwukwe na okwu ọnụ mmadụ 3Ibizi ndụ dị ka onye Kraịst 4Ndị ọgaranya na akụnụba ha 5:1-6Okwu mmechi 5:7-20