1 Ndị Kọrint Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ọ bụ site na nkwusa Pọl ka e ji malite chọọchị dị na Kọrint. Ma mgbe Pọl mesiri si nʼetiti ha pụọ ikwusa oziọma nʼebe ọzọ, ndị nọ na chọọchị a malitere ibi ndụ nke na-ekwesighị ndị Kraịst. Esemokwu, enweghị ịhụnanya, ozizi ụgha dị iche iche, aghara, na mmehie ịkwa iko jupụtara nʼetiti ha. Nʼihi nke a Pọl deere ha akwụkwọ a ịdụ ha ọdụ banyere ihe ọjọọ ndị a ha na-eme, na igosi ha ihe bụ uche Chineke banyere ibi ezi ndụ nke ndị Kraịst.Usoro e si dee ya:Ekele mmalite 1:1-9Nsogbu nke adịghị nʼotu 1:10–4:21Nsogbu nke ịkwa iko 5Nsogbu nke okwu na ụka 6:1-11Nsogbu nke ịchụ nwanyị na iso nwoke 6:12-20Ozizi banyere ọlụlụ di na nwunye 7Ozizi banyere nri dị iche iche 8:1–11:1Ozizi banyere ezi okpukpe 11:2–14:40Ozizi banyere mbilite nʼọnwụ 15Ekele ikpeazụ 16