Hosiya 6 - Igbo Contemporary Bible 2020

Nnọgide na nnupu isi Izrel

1“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị.

Ya onwe ya adọkaala anyị,

ọ ga-agwọkwa anyị;

o tipụla anyị ọnya,

ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.

2Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị.

Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị,

meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.

3Ka anyị mara Onyenwe anyị;

ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.

Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,

nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,

ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,

dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”

4“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?

Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?

Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,

dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.

5Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha.

Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha,

ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.

6Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja,

ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.

7Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m;

nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.

8Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe,

nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.

9Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe,

otu a ka ndị nchụaja

si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem,

leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.

10Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel.

Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna,

emerụọkwala Izrel.

11“Ma nye gị onwe gị, Juda,

owuwe ihe ubi nọ na-eche gị.

“Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help