Emọs Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Emọs buru amụma ya nʼoge Hosiya na Aịzaya, na Maika na-ebu amụma nke ha. Ọ bụ nʼIzrel, alaeze ndị Juu ahụ dị nʼakụkụ ugwu nke ala ahụ, ka ọ nọ buo amụma ndị a. Ma ọ bụkwanụ na Juda ka a nọ mụọ ya. Akwụkwọ Emọs ji ịdọ aka na ntị maka ikpe ọmụma bido. O dere ihe banyere ikpe ọmụma ga-abịakwasị mba dị iche iche, deekwa maka ikpe ọmụma nke ga-abịakwasị ala Izrel. O kwuru okwu megide mmehie dị iche iche ndị bi nʼala ahụ na-eme, dị ka mmehie ekpeghị ikpe ziri ezi, na mmehie iri ngarị, na nke anya ukwu, na nke ikpere arụsị. O sitere nʼọhụ dị iche iche ọ hụrụ dọọ ndị Izrel aka na ntị. Ma o nweghị olileanya ọbụla na ndị Izrel ga-esite nʼajọ omume ha chegharịa.Usoro e si dee ya:Nkọwa maka onye Emọs bụ 1:1-2

Ikpe ọmụma dịrị mba dị iche iche na Izrel 1:3–2:16

Okwu banyere ikpe ọmụma na-abịa 3–6

Ọhụ ise Emọs hụrụ 7:1–9:10

Ngọzị nke oge dị nʼihu 9:11-15

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help