Ilu 22 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ,

ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.

2Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị

onye kere ha niile.

3Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya,

ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.

4Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị,

ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.

5Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu;

ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.

6Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,

mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.

7Dịka ọgaranya si achị ogbenye,

otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.

8Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi,

mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.

9Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi,

nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.

10Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị,

e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.

11Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya,

onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.

12Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma,

ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.

13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi!

A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”

14Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu,

nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.

15Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche,

ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.

16Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike,

maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.

Okwu iri atọ onye maara iheOkwu nke mbụ

17Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe,

tinye uche gị nʼihe m na-akụzi.

18Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị,

ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.

19Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị,

ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị.

20Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a,

bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma?

21Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu.

Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu

ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi.

Okwu nke abụọ

22Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye.

Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe.

23Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha

ma bibiekwa ndị na-emegide ha.

Okwu nke atọ

24Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi,

gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe,

25ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha,

si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.

Okwu nke anọ

26Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe

maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.

27Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ,

a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị.

Okwu nke ise

28Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie.

Nke ndị nna ochie gị ha hiwere.

Okwu nke isii

29Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma?

Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze,

ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help