1 Ndị Eze Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ Ndị Eze nke mbụ na nke abụọ bụ otu akwụkwọ. Akụkọ a kọrọ nʼime ha bụ ihe mezuru nʼala Izrel nʼime narị afọ atọ na iri afọ ise mgbe ndị eze dị iche iche chịrị ala ahụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ akwụkwọ ndị a Akwụkwọ Ndị Eze. Akụkọ dị nʼakwụkwọ ndị Eze nke mbụ malitere site na mgbe Devid nwụrụ. A kọrọ nʼime ya akụkọ gbasara ọchịchị eze Solomọn, ya na owuwu e wuru ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ dị na Jerusalem. Nkewa alaeze Izrel ụzọ abụọ, otu nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ na ndịda, ka a kọkwara akụkọ ha. Ihe e ji mechie akwụkwọ Ndị Eze nke mbụ bụ akụkọ banyere esemokwu dapụtara nʼetiti Ịlaịja onye amụma na Ehab, eze Izrel.Usoro e si dee ya:Ọnwụ Devid 1:1–2:11

Ọchịchị Solomọn 2:12–11:43

Nkewa alaeze Izrel 12:1-24

Akụkọ gbasara ọchịchị alaeze Juda na Izrel 12:25–16:28

Ịlaịja na Ehab 16:29–22:40

Ọchịchị Jehoshafat na Ahazaya 22:41-53

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help