Abụ Ọma 15 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 15Abụ Ọma Devid.Onye ga-ebi nʼugwu nsọ Onyenwe anyị?

1 Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị?

Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị?

2Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta,

onye na-arụ ọrụ ezi omume,

onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya.

3Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ,

onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ,

na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya,

4onye na-eleda onye ajọ omume anya,

ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,

onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere,

ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya,

5onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma,

onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha.

Onye na-eme ihe ndị a

agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help