Aịzaya 38 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ọrịa Hezekaya rịara

1Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”

2Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị,

3“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.

4Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya,

5“Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị.

6Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.

7“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.

8Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.

9Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:

10Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa

ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ,

bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?”

11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ

nʼala ndị dị ndụ,

m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ,

maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.

12Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m

dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ.

Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa

o bipụla ndụ site nkwe-akwa,

ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.

13Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.

Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile.

Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa.

14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.

Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ.

Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe.

Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”

15Ma gịnị ka m ga-ekwu?

Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a.

M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile

nʼihi ihe mwute nke obi m.

16Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.

Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha.

I nyeghachila m ahụ ike,

mee ka m dị ndụ.

17Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,

ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a.

Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m

site nʼolulu nke ịla nʼiyi.

I werela mmehie m niile

wefee nʼazụ gị.

18Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,

ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto.

Ndị na-arịda nʼolulu

agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.

19Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,

dị ka m na-eme taa.

Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha

mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.

20 Onyenwe anyị ga-azọpụta m,

anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara

nʼụbọchị niile nke ndụ anyị,

nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

21Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”

22Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help