Abụ Ọma 96 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 96Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị

1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,

bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.

2Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya;

kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.

3Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,

kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.

4Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;

onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.

5Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,

maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.

6Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;

ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.

7Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,

nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.

8Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya;

werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.

9Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya;

maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.

10Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”

Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya;

ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.

11Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ;

ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya.

12Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.

Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ.

13Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa,

ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.

Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe,

jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help