Abụ Akwa Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ihe e dere nʼakwụkwọ a bụ abụ akwa gbasara mbibi ndị agha Babilọn bibiri Jerusalem. O bụ Jeremaya dere ya, gosi anyị ụdị ịla nʼiyi bịakwasịrị Jerusalem. O si otu a mee ka o doo onye ọbụla anya ụdị ahụhụ na-eche ndị Chineke ahụ kpachapụrụ anya jụ irubere Chineke isi. Akwụkwọ Abụ Akwa na-egosi anyị ọnụma Chineke nʼuju ya. Ma o mekwara ka anyị mata na ikwesi ntụkwasị obi Chineke dị ukwuu, na ọ dịghị agwụ agwụ, kama ọ na-apụta ihe ụbọchị niile. Obi ebere Chineke adịghị agwụkwa agwụ.Usoro e si dee ya:Ịla nʼiyi na iru ụjụ nke Jerusalem 1Ọnụma Chineke megide mmehie Jerusalem 2Olileanya ntute dabeere nʼobi ebere Chineke 3Ọnọdụ Jerusalem na mbụ na ọnọdụ ya ugbu a 4Ekpere maka nzọpụta 5