Aịzaya Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ihe e dere nʼakwụkwọ a bụ ihe gbasara ọrụ ibu amụma nke Aịzaya rụrụ nʼala Juda nʼoge ọchịchị ndị eze Juda anọ. Aịzaya rụrụ ọrụ ya naanị na Juda, ma ọ dịkwa ndụ mgbe ndị agha Asịrịa bịara merie ndị Izrel, ma dọtakwa ha nʼagha. Amụma dị iche iche Aịzaya buru dị nʼakwụkwọ a. Ụfọdụ nʼime amụma ndị a metụtara nnapụta Chineke napụtara Juda site nʼaka eze Asịrịa, ndọta nʼagha a ga-emesịa dọta ndị Juda; nlọghachi ndị Juda site nʼala ebe ndị dọtara ha nʼagha bulara ha; ọbịbịa nke Onye nzọpụta, na ọbịbịa nke alaeze Chineke nʼoge dị nʼihu, mgbe ibu agha na-agaghị adịkwa.Usoro e si dee ya:Amụma banyere Juda na mba ndị ọzọ 1–23

Ikpe ọmụma dịrị ụwa nʼihi mmehie 24–27

Amụma banyere Juda na Izrel 28–35

Ọrụ Aịzaya nʼoge ọchịchị Hezekaya 36–39

Nzọpụta Chineke na ọnọdụ Juda nʼoge dị nʼihu 40–66

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help