Abụ Ọma 3 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 3Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ.Ekpere maka enyemaka

1O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.

2Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,

“Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela

3Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;

I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.

4Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,

ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela

5Edinara m ala, hie ụra,

ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.

6A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,

agaghị m atụ egwu ọbụla.

7Bilie Onyenwe anyị!

Zọpụta m Chineke m!

Tie ndị iro m niile aka nʼagba;

tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.

8Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa.

Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help