Emọs 6 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ahụhụ dịrị ndị na-ebi ndụ dị jụụ

1Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn,

na ndị ahụ na-ebi nʼizuoke nʼugwu Sameria,

bụ ndị a maara aha ha na isi mba nke mba niile,

ndị agbụrụ Izrel niile na-abịakwute.

2Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya,

site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ,

mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia

Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma?

Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu?

3Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ

ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.

4Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi,

na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha,

na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma

na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba.

5Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara,

ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.

6Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba;

na-ete mmanụ makarịsịrị mma,

ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha.

7Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ.

Na mberede, oke oriri unu na idina ala setịa onwe unu ga-akwụsị.

Mpako bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị

8Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị,

“Ihe arụ ka mfụli elu nke Jekọb bụrụ m;

ana m akpọkwa ebe ya niile e wusiri ike asị.

Nʼihi ya, aghaghị m iwere obodo a

na ihe niile dị ya nʼime nyefee nʼaka ndị ọzọ.”

9Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ.

10Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”

11Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu.

Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ,

tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile.

12Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume?

Mmadụ ọ na-eji ehi abụọ e jikọtara ọnụ akọ elu osimiri?

Ma unu atụgharịala ikpe ziri ezi mee ya ka ọ ghọọ nsi,

mkpụrụ nke ezi omume ka unu mekwara ka ọ ghọọ ihe ilu.

13Unu ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na unu meriri obodo Lo Deba,

ndị na-asị, “Ọ bụghị site nʼike aka anyị ka anyị nwetakwara Kanaịm?”

14“Ma lee, aghaghị m ime ka otu mba bilie imegide unu, ụlọ Izrel,”

otu a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.

“Ha ga-emekpa unu ahụ site nʼụzọ niile

site na Lebo Hamat ruo ndagwurugwu Araba.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help