Ọbadaya Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ihe dị nʼakwụkwọ a bụ amụma Ọbadaya buru megide Edọm. Edọm bụ obodo ahụ nyeere ndị iro Juda aka laa Jerusalem nʼiyi. Ndị obodo Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, nwanne Jekọb, onye bụ nna nna ochie ndị Izrel. Ọbadaya kwuru okwu megide ihe ọjọọ ahụ Edọm mere. Nʼihi na kama ndị Edọm ga-apụta nyere ndị Izrel aka ịlụso ndị iro ha ọgụ, ha gara nyere ndị iro ahụ aka imegide ndị Izrel, sorokwa ha kwakọọ akụnụba ndị Izrel. Nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha mere, ikpe ọmụma Chineke ga-abịakwasị ha.Usoro e si dee ya:Amụma banyere mbibi Edọm: 1-9

Ihe ọjọọ Edọm mere: 10-14

Nlọghachi nke ndị a dọtara nʼagha: 15-21

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help