Abụ Ọma 42 - Igbo Contemporary Bible 2020

Nchịkọta Akwụkwọ nke Abụọ Abụ Ọma 42–72Abụ Ọma 42Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora.Iru ụjụ na nkasiobi onye ezi omume

1Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele,

otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.

2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ.

Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?

3Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri

nʼehihie ma nʼabalị,

mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile,

“Olee ebe Chineke gị nọ?”

4Ihe ndị a ka m na-echeta

mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m:

ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga,

mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha

nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi,

na-aga nʼụlọ Chineke.

5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?

Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?

Nwee olileanya na Chineke,

nʼihi na m ka ga-eto ya,

Onye nzọpụta m na Chineke m.

6Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m;

ya mere, aga m echeta gị

site nʼala Jọdan,

na ebe dị elu nke Hemon, na sitekwa nʼugwu Miza.

7Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri

mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile;

ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile

ekpuchiela isi m.

8Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,

nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,

ekpere nye Chineke nke ndụ m.

9Ana m asị Chineke, oke nkume m,

“Gịnị mere i ji chefuo m?

Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ

nʼihi mmegbu nke onye iro?”

10Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu,

mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị,

ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m,

“Olee ebe Chineke gị nọ?”

11O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?

Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?

Nwee olileanya na Chineke,

nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,

Onye nzọpụta m na Chineke m.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help