Aịzaya 9 - Igbo Contemporary Bible 2020

A mụụrụ anyị otu nwa

1Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.

2Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị

ahụla ìhè dị ukwuu;

ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ

ka ìhè nwukwasịrị.

3I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu,

mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu,

ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị,

dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi,

dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ

mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.

4Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia,

i gbajisiela

ibu arọ niile e bokwasịrị ha,

ihe mgbochi nke dị nʼubu ha,

nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.

5Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi,

na uwe agha nke ọbara mechuru,

ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ,

ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.

6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,

e nyekwala anyị otu nwa nwoke.

Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.

Ndị a ga-abụ aha ya,

Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,

Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.

7Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo

nke na-enweghị ọgwụgwụ.

Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị,

chịakwa nʼalaeze ya.

Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike;

ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa

site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

ga-emezukwa nke a.

Iwe Onyenwe anyị

megide Izrel

8Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb

ọ ga-adakwasịkwa Izrel.

9Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya,

Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa

bụ ndị na-eji nganga

na mpako na-ekwu sị,

10“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala

ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha;

ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị,

ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”

11Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha,

ọ kwaliekwala ndị iro ha.

12Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ

ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,

aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

13Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a,

ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.

14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ,

ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.

15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,

ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.

16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;

ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.

17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ,

ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ,

nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume,

ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,

aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:

ọ na-erepịa ogwu na uke,

ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,

mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.

19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,

ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;

ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;

ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.

20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe,

onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri.

Ha ga-eri

ma afọ agaghị eju ha;

nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.

21Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ.

Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ.

Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help